Native Bible

Genesis 47:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ Josef zara sị ha: “Jirinụ anụ ụlọ unu kwụọ ụgwọ nri m ga-enye unu, ebe ọ bụ na ego unu agwụla.”

Genesis 47:16 in English

Genesis 47:16 · Berean Standard Bible

“Then bring me your livestock,” said Joseph. “Since the money is gone, I will sell you food in exchange for your livestock.”

Context

14Josef chịkọtara ego niile dị nʼala Ijipt, na nʼala Kenan, nke ndị mmadụ ji kwụọ ụgwọ nri ha zụrụ webata ha nʼụlọeze Fero. 15Mgbe ego niile dị ndị mmadụ nʼaka gwụchara nʼala Ijipt ma nʼala Kenan, ndị Ijipt niile bịakwutere Josef sị ya, “Nye anyị nri, gịnị mere anyị ga-eji nwụọ nʼihu gị? Ego anyị agwụla.” 16Mgbe ahụ Josef zara sị ha: “Jirinụ anụ ụlọ unu kwụọ ụgwọ nri m ga-enye unu, ebe ọ bụ na ego unu agwụla.” 17Ya mere, ha kpụtaara Josef anụ ụlọ ha. Josef nyere ha nri nʼọnọdụ ịnyịnya ha, na atụrụ ha, na ewu ha, na ehi, na ịnyịnya ibu ha. O were nri zụọ ha nʼafọ ahụ nʼọnọdụ anụ ụlọ ha niile. 18Mgbe afọ ahụ gafesịrị, ha bịakwutekwara ya nʼafọ nke ọzọ sị ya, “Anyị agaghị ezoro onyenwe anyị na ego anyị agwụla, na igwe anụ ụlọ anyị bụkwa nke gị. O nweghị ihe ọzọ fọdụrụ anyị karịa ahụ anyị na ala anyị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.