Jenesis 46:30
Genesis 46:30 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Izrel gwara Josef sị, “Ugbu a ejikerela m ịnwụ, ebe m hụrụ ihu gị anya ọzọ, mata na ị ka dị ndụ.”
Genesis 46:30 in English
Genesis 46:30 · Berean Standard Bible
Then Israel said to Joseph, “Finally I can die, now that I have seen your face and know that you are still alive!”
Context
28Jekọb zipụrụ Juda ka jekwuru Josef ịjụta ya ụzọ Goshen. Mgbe ha rutere nʼala Goshen, 29Josef kwadoro ịnyịnya ụgbọ ya gawa Goshen izute nna ya Izrel. Mgbe Josef bịara nʼihu nna ya, ọ makụrụ ya, bee akwa ogologo oge. 30Izrel gwara Josef sị, “Ugbu a ejikerela m ịnwụ, ebe m hụrụ ihu gị anya ọzọ, mata na ị ka dị ndụ.” 31Mgbe ahụ, Josef gwara ụmụnne ya na ndị ezinaụlọ nna ya niile sị, “Ka m gaa kọọrọ Fero. Ka m gaa sị ya, ‘Ụmụnne m na ezinaụlọ nna m, ndị bi nʼala Kenan abịakwutela m. 32Ha bụ ndị ọzụzụ atụrụ, ndị na-elekọta anụ ụlọ. Ha chị igwe ewu na atụrụ ha, na igwe ehi ha, na ihe niile ha ji biri.’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.