Native Bible

Genesis 46:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Chineke gwara ya sị, “Abụ m Chineke, Chineke nke nna gị. Atụla egwu ịgbada Ijipt nʼihi na aga m eme gị ka ị ghọọ mba dị ukwuu nʼebe ahụ.

Genesis 46:3 in English

Genesis 46:3 · Berean Standard Bible

“I am God,” He said, “the God of your father. Do not be afraid to go down to Egypt, for I will make you into a great nation there.

Context

1Izrel biliri ije, ya na ihe niile o nwere rute Bịasheba. Ebe a, ọ chụrụ aja nye Chineke nke nna ya Aịzik. 2Chineke gwara Izrel okwu nʼọhụ nke abalị. Ọ sịrị, “Jekọb! Jekọb!” Ọ zara sị, “Lee m nʼebe a.” 3Chineke gwara ya sị, “Abụ m Chineke, Chineke nke nna gị. Atụla egwu ịgbada Ijipt nʼihi na aga m eme gị ka ị ghọọ mba dị ukwuu nʼebe ahụ. 4Mụ onwe m ga-eso gị agbada nʼala Ijipt. Mụ onwe m ga-akpọlatakwa gị ọzọ. Josef nʼonwe ya ga-eji aka ya ekpuchikwa gị anya.” 5Jekọb mechara si na Bịasheba pụta. Ụmụ Izrel kuuru Jekọb nna ha, na ụmụaka ha na ndị nwunye ha, kubanye nʼụgbọala ahụ Fero zitere ka ha ji bute ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.