Jenesis 45:19
Genesis 45:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Gwakwa ụmụnne gị okwu sị ha, ‘Sitenụ nʼala Ijipt were ụgbọala, nke unu ga-eji budata ndị nwunye unu na ụmụntakịrị unu. Dutekwanụ nna unu.
Genesis 45:19 in English
Genesis 45:19 · Berean Standard Bible
You are also directed to tell them: ‘Take wagons from the land of Egypt for your young children and your wives, and bring your father and come back.
Context
17Fero gwara Josef sị ya, “Gwa ụmụnne gị, ka ha mee ihe otu a, ha bokwasị ịnyịnya ibu unu ibu laghachikwa nʼala Kenan. 18Ha ruo, ha kpọta nna gị, na ezinaụlọ ha, ka ha lọghachikwute m nʼala Ijipt. Nʼihi na aga m enye ha ala kachasị mma nʼIjipt. Ha onwe ha ga-erikwa uru ala ahụ. 19“Gwakwa ụmụnne gị okwu sị ha, ‘Sitenụ nʼala Ijipt were ụgbọala, nke unu ga-eji budata ndị nwunye unu na ụmụntakịrị unu. Dutekwanụ nna unu. 20Unu esogbula onwe unu banyere ngwa ụlọ unu, nʼihi na ihe niile dị mma nʼala Ijipt bụ nke unu.’ ” 21Ya mere ụmụ Izrel mere ihe ndị a. Josef nyere ha ụgbọala dịka Fero nyere nʼiwu. O nyekwara ha nri ha ga-eri nʼụzọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.