Native Bible

Genesis 45:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Nʼezie, anya unu na nʼanya nwanne m Benjamin, ahụla na mụ onwe m ji ọnụ m na-agwa unu okwu ndị a.

Genesis 45:12 in English

Genesis 45:12 · Berean Standard Bible

Behold! You and my brother Benjamin can see that I, Joseph, am the one speaking with you.

Context

10Ị ga-ebi nʼala Goshen,* ka i nwee ike ịnọ m nso, gị na ụmụ gị, na ụmụ ụmụ gị, na igwe ewu na atụrụ gị, na igwe ehi gị, na ihe niile i nwere. 11Nʼebe ahụ ka m ga-enyekwa gị ihe ị chọrọ, nʼihi na ụnwụ afọ ise ka dị nʼihu na-abịa. Ọ bụrụ na i meghị otu a, gị na ezinaụlọ gị na ihe niile bụ nke gị ga-ada ụkpa.’ 12“Nʼezie, anya unu na nʼanya nwanne m Benjamin, ahụla na mụ onwe m ji ọnụ m na-agwa unu okwu ndị a. 13Unu ga-akọrọ nna m maka nsọpụrụ niile a na-enye m nʼala Ijipt na ihe niile unu hụrụ. Kpọtakwanụ nna m ọsịịsọ ebe a.” 14Ugbu a, ọ dakwasịrị nʼolu Benjamin, nwanne ya, kwaa akwa. Benjamin jidekwara ya nʼolu kwaa akwa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.