Jenesis 45:11
Genesis 45:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼebe ahụ ka m ga-enyekwa gị ihe ị chọrọ, nʼihi na ụnwụ afọ ise ka dị nʼihu na-abịa. Ọ bụrụ na i meghị otu a, gị na ezinaụlọ gị na ihe niile bụ nke gị ga-ada ụkpa.’
Genesis 45:11 in English
Genesis 45:11 · Berean Standard Bible
And there I will provide for you, because there will be five more years of famine. Otherwise, you and your household and everything you own will come to destitution.’
Context
9Ugbu a, meenụ ngwa lakwuru nna m, sị ya, ‘Ihe ndị a ka Josef nwa gị nwoke kwuru, Chineke emeela m onye na-achị Ijipt niile. Egbula oge ịbịakwute m. 10Ị ga-ebi nʼala Goshen,* ka i nwee ike ịnọ m nso, gị na ụmụ gị, na ụmụ ụmụ gị, na igwe ewu na atụrụ gị, na igwe ehi gị, na ihe niile i nwere. 11Nʼebe ahụ ka m ga-enyekwa gị ihe ị chọrọ, nʼihi na ụnwụ afọ ise ka dị nʼihu na-abịa. Ọ bụrụ na i meghị otu a, gị na ezinaụlọ gị na ihe niile bụ nke gị ga-ada ụkpa.’ 12“Nʼezie, anya unu na nʼanya nwanne m Benjamin, ahụla na mụ onwe m ji ọnụ m na-agwa unu okwu ndị a. 13Unu ga-akọrọ nna m maka nsọpụrụ niile a na-enye m nʼala Ijipt na ihe niile unu hụrụ. Kpọtakwanụ nna m ọsịịsọ ebe a.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.