Native Bible

Genesis 43:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe Josef lọtara ụlọ, ha wetaara ya onyinye dị nʼaka ha, daa nʼala, kpọọ isiala nye ya.

Genesis 43:26 in English

Genesis 43:26 · Berean Standard Bible

When Joseph came home, they presented him with the gifts they had brought, and they bowed to the ground before him.

Context

24Nʼoge ahụ, odibo ahụ duuru ndị ikom ndị ahụ bata nʼụlọ Josef, nye ha mmiri ha ji saa ụkwụ ha. O nyekwara ịnyịnya ibu ha nri. 25Mgbe ahụ, ụmụ Jekọb kwadoro onyinye ịnata ihuọma ha ji bịa, nke ha ga-enye Josef ma ọ bata nʼetiti ehihie, nʼihi na ha anụla na ha ga-eri nri nʼebe ahụ. 26Mgbe Josef lọtara ụlọ, ha wetaara ya onyinye dị nʼaka ha, daa nʼala, kpọọ isiala nye ya. 27Josef jụrụ ha ajụjụ banyere ọdịmma ha, jụọkwa ha sị, “Agadi nna unu, nke unu gwara m ihe banyere ya, ahụ ọ dịkwa ya? Ọ ka dịkwa ndụ.” 28Ha zaghachiri sị ya, “Ahụ dị ohu gị bụ nna anyị. Ọ ka nọ ndụ.” Ha hulatara isi ha, kpọọ isiala nye ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.