Native Bible

Genesis 42:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Josef nyere iwu ka e kpojuo ọka nʼakpa ha, tinyekwara onye ọbụla ego ọ kwụrụ nʼakpa ya. Ọ nyere iwu ka e nye ha ihe ha ga-eri nʼụzọ. Mgbe e mesịrị ihe ndị a,

Genesis 42:25 in English

Genesis 42:25 · Berean Standard Bible

Then Joseph gave orders to fill their bags with grain, to return each man’s silver * to his sack, and to give them provisions for their journey. This order was carried out,

Context

23Ha amataghị na Josef na-anụ ihe ha na-ekwu, nʼihi na onye nsụgharị okwu nọ nʼetiti ha. 24O sitere nʼebe ha nọ tụgharịa gaa kwaa akwa. Ọ lọghachikwutere ha ọzọ gwakwa ha okwu. O si nʼetiti ha kpọpụta Simiọn kee ya agbụ ka ha na-ele ya anya. 25Josef nyere iwu ka e kpojuo ọka nʼakpa ha, tinyekwara onye ọbụla ego ọ kwụrụ nʼakpa ya. Ọ nyere iwu ka e nye ha ihe ha ga-eri nʼụzọ. Mgbe e mesịrị ihe ndị a, 26ha bokwasịrị ịnyịnya ibu akpa ọka ha nʼotu nʼotu. Ha hapụrụ Ijipt lawa. 27Mgbe ha ruru ebe ha nọrọ ọnọdụ abalị, otu nʼime ha meghere akpa ya ka o nye ịnyịnya ibu ya ọka, ọ hụrụ ego ya nʼọnụ akpa ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.