Native Bible

Genesis 41:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼatụfughị oge, ehi asaa ọzọ soro ha nʼazụ sikwa nʼosimiri Naịl na-apụta. Ma ehi ndị a tara ahụ nke ukwuu. Ha bụ nnọọ ọkpụkpụ ọkpụkpụ, jọọ njọ ile anya. Ha bịara guzo nʼakụkụ ehi ndị ahụ buru ibu.

Genesis 41:3 in English

Genesis 41:3 · Berean Standard Bible

After them, seven other cows, sickly and thin, came up from the Nile and stood beside the well-fed cows on the bank of the river.

Context

1O ruo mgbe afọ abụọ gasịrị, Fero rọrọ nrọ hụ onwe ya ka o guzo nʼakụkụ mmiri Naịl. 2Nʼebe ahụ, ọ hụrụ ehi asaa ndị si nʼosimiri Naịl na-apụta. Ehi ndị a buru ibu, maa mma. Ahụ ha na-akwọ mụrụmụrụ. Ha pụtara, bido ịta nri nʼetiti ahịhịa riidi. 3Nʼatụfughị oge, ehi asaa ọzọ soro ha nʼazụ sikwa nʼosimiri Naịl na-apụta. Ma ehi ndị a tara ahụ nke ukwuu. Ha bụ nnọọ ọkpụkpụ ọkpụkpụ, jọọ njọ ile anya. Ha bịara guzo nʼakụkụ ehi ndị ahụ buru ibu. 4Mgbe ahụ, ehi ndị a bụ naanị ọkpụkpụ ọkpụkpụ bịara richapụ ehi ndị ahụ buru ibu. Mgbe nke a mere Fero kwolitere. 5Emesịa, Fero rahụkwara ụra ọzọ, rọọ nrọ nke ugboro abụọ, hụ ogbe ọka asaa ndị mịrị nʼotu ukwu ọka. Ogbe ọka ndị a buru ibu maa ezi mma.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.