Jenesis 41:27
Genesis 41:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ehi asaa ndị ọzọ ahụ dị ọkpụkpụ ọkpụkpụ ndị pụtara mgbe ndị nke mbụ pụtachara bụ afọ asaa. Otu a kwa ogbe ọka ndị ọzọ fịkpọrọ afịkpọ nke ikuku si nʼọwụwa anyanwụ mere ka ha fịkpọọ bụ afọ asaa. Ha na-egosi afọ asaa mgbe oke ụnwụ ga-adị.
Genesis 41:27 in English
Genesis 41:27 · Berean Standard Bible
Moreover, the seven thin, ugly cows that came up after them are seven years, and so are the seven worthless heads of grain scorched by the east wind—they are seven years of famine.
Context
25Mgbe ahụ, Josef sịrị Fero, “Nrọ abụọ Fero rọrọ pụtara otu ihe. Chineke esitela na nrọ ndị a gwa Fero ihe ọ na-aga ime. 26Ehi asaa ndị ahụ buru ibu bụ afọ asaa. Ogbe ọka asaa ndị ahụ buru ibu bụkwa afọ asaa. Ọ bụ otu nrọ ahụ, ọ bụ ezie na ị rọrọ ya ugboro abụọ. 27Ehi asaa ndị ọzọ ahụ dị ọkpụkpụ ọkpụkpụ ndị pụtara mgbe ndị nke mbụ pụtachara bụ afọ asaa. Otu a kwa ogbe ọka ndị ọzọ fịkpọrọ afịkpọ nke ikuku si nʼọwụwa anyanwụ mere ka ha fịkpọọ bụ afọ asaa. Ha na-egosi afọ asaa mgbe oke ụnwụ ga-adị. 28“Dịka m gwara Fero na mbụ, Chineke egosila gị ihe ọ chọrọ ime. 29Afọ asaa na-abịa ga-abụ afọ asaa mgbe nri ga-adị ukwuu nʼala Ijipt niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.