Native Bible

Genesis 41:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, Josef sịrị Fero, “Nrọ abụọ Fero rọrọ pụtara otu ihe. Chineke esitela na nrọ ndị a gwa Fero ihe ọ na-aga ime.

Genesis 41:25 in English

Genesis 41:25 · Berean Standard Bible

At this, Joseph said to Pharaoh, “The dreams of Pharaoh are one and the same. God has revealed to Pharaoh what He is about to do.

Context

23Ogbe ọka asaa ọzọ mịkwara nʼelu ukwu ọka ahụ, ma ndị a kpọnwụrụ akpọnwụ, fịkpọkwa afịkpọ nʼihi nʼikuku si nʼọwụwa anyanwụ chakpọrọ ha. 24Ma ọka ndị a fịkpọrọ afịkpọ lodara ọka asaa ndị ahụ mara mma. Akọọlara m ndị majiki ihe ndị a, ma ọ dịghị onye nʼime ha nwere ike ịkọwara m ihe nrọ ndị a pụtara.” 25Mgbe ahụ, Josef sịrị Fero, “Nrọ abụọ Fero rọrọ pụtara otu ihe. Chineke esitela na nrọ ndị a gwa Fero ihe ọ na-aga ime. 26Ehi asaa ndị ahụ buru ibu bụ afọ asaa. Ogbe ọka asaa ndị ahụ buru ibu bụkwa afọ asaa. Ọ bụ otu nrọ ahụ, ọ bụ ezie na ị rọrọ ya ugboro abụọ. 27Ehi asaa ndị ọzọ ahụ dị ọkpụkpụ ọkpụkpụ ndị pụtara mgbe ndị nke mbụ pụtachara bụ afọ asaa. Otu a kwa ogbe ọka ndị ọzọ fịkpọrọ afịkpọ nke ikuku si nʼọwụwa anyanwụ mere ka ha fịkpọọ bụ afọ asaa. Ha na-egosi afọ asaa mgbe oke ụnwụ ga-adị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.