Native Bible

Genesis 41:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, ahụrụ m ehi asaa si na mmiri ahụ pụta. Ehi ndị a mara abụba, ma gbaa agba. Ha bidokwara ịta nri nʼetiti ahịhịa riidi.*

Genesis 41:18 in English

Genesis 41:18 · Berean Standard Bible

when seven cows, well-fed and sleek, came up from the river and began to graze among the reeds.

Context

16Josef zara sị ya, “Enweghị m ike ịkọwa nrọ nʼike aka m. Ma Chineke ga-enye Fero ọsịsa udo dịka ọ chọrọ.” 17Mgbe ahụ, Fero malitere ịkọwara Josef nrọ ya. O kwuru sị, “Eguzoro m nʼakụkụ osimiri Naịl na nrọ m. 18Mgbe ahụ, ahụrụ m ehi asaa si na mmiri ahụ pụta. Ehi ndị a mara abụba, ma gbaa agba. Ha bidokwara ịta nri nʼetiti ahịhịa riidi.* 19Emesịa, a hụrụ m ehi asaa ọzọ ka ha sikwa nʼosimiri ahụ pụta. Ehi ndị a ejighị ahụ. Ha bụ ọkpụkpụ ọkpụkpụ, jọọ njọ ile anya. Nʼezie, ahụtụbeghị m ụdị ehi dị otu a nʼala Ijipt niile. 20Ehi asaa ndị a jọrọ njọ riri ehi ndị ahụ buru ibu, bụ ndị bu ha ụzọ si nʼosimiri ahụ pụta.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.