Native Bible

Genesis 41:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ihe niile mere dịka o si kọwara anyị. E nyeghachiri m ọnọdụ m, ma kwụba onye nke ọzọ nʼosisi.”

Genesis 41:13 in English

Genesis 41:13 · Berean Standard Bible

And it happened to us just as he had interpreted: I was restored to my position, and the other man was hanged.”

Context

11Onye ọbụla nʼime anyị abụọ rọrọ nrọ nʼotu abalị, nrọ ọbụla nwekwara nkọwa nke ya. 12O nwere nwokorobịa onye Hibru anyị na ya nọ nʼụlọ mkpọrọ nʼoge ahụ. Ọ bụ ohu onyeisi ndị nche eze. Anyị kọọrọ ya nrọ anyị rọrọ. Ọ kọwakwaara anyị ihe nrọ anyị pụtara nye onye ọbụla nkọwa nke nrọ ya. 13Ihe niile mere dịka o si kọwara anyị. E nyeghachiri m ọnọdụ m, ma kwụba onye nke ọzọ nʼosisi.” 14Ya mere Fero ziri ozi ka a kpọọ Josef. E mere ngwangwa wepụta ya site nʼụlọ mkpọrọ ahụ. Mgbe ọ kpụchara afụọnụ* ya, gbanwee uwe ya, ọ bịakwara nʼihu Fero. 15Fero gwara Josef sị, “Arọrọ m nrọ ma o nweghị onye ọbụla nwere ike ịkọwara m ihe nrọ m rọrọ pụtara. Ma anụla m na a kọọrọ gị nrọ a rọrọ, i nwere ike ịkọwa ihe nrọ ahụ pụtara.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.