Jenesis 41:11
Genesis 41:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye ọbụla nʼime anyị abụọ rọrọ nrọ nʼotu abalị, nrọ ọbụla nwekwara nkọwa nke ya.
Genesis 41:11 in English
Genesis 41:11 · Berean Standard Bible
One night both the chief baker and I had dreams, and each dream had its own meaning.
Context
9Ma nʼoge ahụ, onyeisi ndị na-ebu iko jekwuuru Fero gwa ya sị, “Taa ka m chetara mmehie m. 10Oge ahụ Fero were iwe megide ndị na-ejere ya ozi, o tinyere mụ na onyeisi ndị na-esi nri nʼụlọ mkpọrọ nke dị nʼebe onyeisi ndị nche eze bi. 11Onye ọbụla nʼime anyị abụọ rọrọ nrọ nʼotu abalị, nrọ ọbụla nwekwara nkọwa nke ya. 12O nwere nwokorobịa onye Hibru anyị na ya nọ nʼụlọ mkpọrọ nʼoge ahụ. Ọ bụ ohu onyeisi ndị nche eze. Anyị kọọrọ ya nrọ anyị rọrọ. Ọ kọwakwaara anyị ihe nrọ anyị pụtara nye onye ọbụla nkọwa nke nrọ ya. 13Ihe niile mere dịka o si kọwara anyị. E nyeghachiri m ọnọdụ m, ma kwụba onye nke ọzọ nʼosisi.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.