Native Bible

Genesis 40:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe chi bọrọ, Josef bịakwutere ha hụ na ihu ha gbarụrụ agbarụ.

Genesis 40:6 in English

Genesis 40:6 · Berean Standard Bible

When Joseph came to them in the morning, he saw that they were distraught.

Context

4Onyeisi ndị nche mere Josef onye na-elekọta ha. Ha nọrọ nʼụlọ mkpọrọ ọtụtụ ụbọchị. 5Ha abụọ, onye ahụ na-esiri eze nri, na onye na-ebu iko eze Ijipt, rọrọ nrọ nʼotu abalị. Nrọ nke onye ọ bụla nwere nkọwa nke ya. 6Mgbe chi bọrọ, Josef bịakwutere ha hụ na ihu ha gbarụrụ agbarụ. 7Nʼihi ya, ọ jụrụ ndị ozi Fero ndị a ha na ya nọ nʼụlọ mkpọrọ dị nʼụlọ nna ya ukwu sị ha, “Gịnị mere ihu unu ji gbarụọ taa?” 8Ha zara sị ya, “Anyị rọrọ nrọ ọjọọ, ma onye nkọwa ya adịghị.” Josef sịrị ha, “Ọ bụghị Chineke nwee ike ịkọwa nrọ? Kọọrọnụ* m ha.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.