Jenesis 40:22
Genesis 40:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ọ kwụgburu onyeisi ndị na-esiri ya nri, dịka Josef si kọwaa nrọ ha.
Genesis 40:22 in English
Genesis 40:22 · Berean Standard Bible
But Pharaoh hanged the chief baker, just as Joseph had described to them in his interpretation.*
Context
20Nʼabalị nke atọ, site nʼụbọchị ndị a rọrọ nrọ ha, Fero mere mmemme ncheta ọmụmụ ya. Ọ kpọrọ ndị niile na-ejere ya ozi oriri. O ziri ozi ka a gaa nʼụlọ mkpọrọ kpọpụta onyeisi ndị na-ebunye ya iko ihe ọṅụṅụ na onyeisi ndị na-esiri ya nri. 21O nyeghachiri onyeisi ndị na-ebu iko ya ọrụ ya, weghachi ya nʼọnọdụ ya. Nwoke a bunyekwara Fero iko ya dịka o si eme na mbụ. 22Ma ọ kwụgburu onyeisi ndị na-esiri ya nri, dịka Josef si kọwaa nrọ ha. 23Ma onyeisi ndị ahụ na-ebu iko eze echetaghị Josef. O chefuru ya.
40:8 Maọbụ, Unu zere m nrọ unu
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.