Jenesis 40:15
Genesis 40:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ ntọrọ ka atọọrọ m site nʼala ndị Hibru. Nʼotu aka ahụ, nʼebe a ọ dịkwaghị ihe ọjọọ ọ bụla m mere nke kwesiri ka atụnye m nʼụlọ mkpọrọ a.”
Genesis 40:15 in English
Genesis 40:15 · Berean Standard Bible
For I was kidnapped from the land of the Hebrews, and even here I have done nothing for which they should have put me in this dungeon.”
Context
13Nʼime abalị atọ Fero ga-akpọpụta gị, mee ka i nwere onwe gị. Fero ga-enyeghachikwa gị ọrụ gị. Ị ga-etinyekwa Fero iko ya nʼaka dịka i si eme na mbụ mgbe ị bụ onye na-ebu iko ya. 14Mgbe ihe gaara gị nke ọma, chetakwa m, ma gosi m obiọma, gwara m Fero ka o si nʼụlọ mkpọrọ a wepụta m. 15Ọ bụ ntọrọ ka atọọrọ m site nʼala ndị Hibru. Nʼotu aka ahụ, nʼebe a ọ dịkwaghị ihe ọjọọ ọ bụla m mere nke kwesiri ka atụnye m nʼụlọ mkpọrọ a.” 16Mgbe onyeisi ndị na-esiri Fero nri hụrụ na nkọwa nrọ ahụ dị mma, ọ sịrị Josef, “Mụ onwe m, na nrọ m nke m, ebu m nkata achịcha atọ nʼisi. 17Nkata nke dị nʼelu jupụtara na achịcha dị iche iche e gheere eze, bụ Fero. Ma ụmụ nnụnụ bịara na-eri achịcha ndị ahụ dị na nkata m bụ nʼisi.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.