Native Bible

Genesis 40:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ihe gaara gị nke ọma, chetakwa m, ma gosi m obiọma, gwara m Fero ka o si nʼụlọ mkpọrọ a wepụta m.

Genesis 40:14 in English

Genesis 40:14 · Berean Standard Bible

But when it goes well for you, please remember me and show me kindness by mentioning me to Pharaoh, that he might bring me out of this prison.

Context

12Josef sịrị ya, “Nke a bụ ihe nrọ gị pụtara. Alaka atọ ahụ bụ abalị atọ. 13Nʼime abalị atọ Fero ga-akpọpụta gị, mee ka i nwere onwe gị. Fero ga-enyeghachikwa gị ọrụ gị. Ị ga-etinyekwa Fero iko ya nʼaka dịka i si eme na mbụ mgbe ị bụ onye na-ebu iko ya. 14Mgbe ihe gaara gị nke ọma, chetakwa m, ma gosi m obiọma, gwara m Fero ka o si nʼụlọ mkpọrọ a wepụta m. 15Ọ bụ ntọrọ ka atọọrọ m site nʼala ndị Hibru. Nʼotu aka ahụ, nʼebe a ọ dịkwaghị ihe ọjọọ ọ bụla m mere nke kwesiri ka atụnye m nʼụlọ mkpọrọ a.” 16Mgbe onyeisi ndị na-esiri Fero nri hụrụ na nkọwa nrọ ahụ dị mma, ọ sịrị Josef, “Mụ onwe m, na nrọ m nke m, ebu m nkata achịcha atọ nʼisi.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.