Jenesis 39:22
Genesis 39:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyeisi ndị na-eche ụlọ mkpọrọ mere Josef onyeisi ndị mkpọrọ niile nọ nʼime ụlọ mkpọrọ ahụ. Josef ghọrọ onye a na-ajụ otu ihe si aga nʼime ụlọ mkpọrọ ahụ.
Genesis 39:22 in English
Genesis 39:22 · Berean Standard Bible
And the warden put all the prisoners under Joseph’s care, so that he was responsible for all that was done in the prison.
Context
20Nna ukwu Josef weere ya tụnye nʼụlọ mkpọrọ, nʼebe a na-etinye ndị mkpọrọ eze Ijipt.
Ma ebe ahụ Josef nọ nʼụlọ mkpọrọ, 21Onyenwe anyị nọnyeere ya. O meere ya ebere, mekwa ka o nweta ihuọma nʼebe onyeisi ndị nche ụlọ mkpọrọ ahụ nọ. 22Onyeisi ndị na-eche ụlọ mkpọrọ mere Josef onyeisi ndị mkpọrọ niile nọ nʼime ụlọ mkpọrọ ahụ. Josef ghọrọ onye a na-ajụ otu ihe si aga nʼime ụlọ mkpọrọ ahụ. 23Onyeisi ndị nche ụlọ mkpọrọ ahụ enyeghịkwa onwe ya nsogbu maka ihe ọbụla. Nʼihi na Onyenwe anyị nọnyeere Josef, mee ka ihe ọbụla ọ na-eme gaa nke ọma.
39:6 Usoro iri nri ndị Ijipt dị iche site na nke ndị Juu, nʼihi ụzọ esi akwado ha tupu e rie ha. Jen 43:32
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.