Jenesis 39:20
Genesis 39:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nna ukwu Josef weere ya tụnye nʼụlọ mkpọrọ, nʼebe a na-etinye ndị mkpọrọ eze Ijipt. Ma ebe ahụ Josef nọ nʼụlọ mkpọrọ,
Genesis 39:20 in English
Genesis 39:20 · Berean Standard Bible
So Joseph’s master took him and had him thrown into the prison where the king’s prisoners were confined. While Joseph was there in the prison,
Context
18Ma mgbe m welitere olu tie mkpu enyemaka o sitere nʼụlọ gbapụ hapụrụ m uwe ya.” 19Mgbe nna ya ukwu nụrụ ihe nwunye ya gwara ya sị, “Otu a ka ohu gị si meso m mmeso,” o were iwe dị ọkụ. 20Nna ukwu Josef weere ya tụnye nʼụlọ mkpọrọ, nʼebe a na-etinye ndị mkpọrọ eze Ijipt.
Ma ebe ahụ Josef nọ nʼụlọ mkpọrọ, 21Onyenwe anyị nọnyeere ya. O meere ya ebere, mekwa ka o nweta ihuọma nʼebe onyeisi ndị nche ụlọ mkpọrọ ahụ nọ. 22Onyeisi ndị na-eche ụlọ mkpọrọ mere Josef onyeisi ndị mkpọrọ niile nọ nʼime ụlọ mkpọrọ ahụ. Josef ghọrọ onye a na-ajụ otu ihe si aga nʼime ụlọ mkpọrọ ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.