Jenesis 38:8
Genesis 38:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, Juda sịrị Onan, “Bakwuru nwunye nwanne gị ka ịkuchie ya, ka i si otu a wulite mkpụrụ maka nwanne gị.”
Genesis 38:8 in English
Genesis 38:8 · Berean Standard Bible
Then Judah said to Onan, “Sleep with your brother’s wife. Perform your duty as her brother-in-law and raise up offspring for your brother.”
Context
6Juda lụtaara Ịa, ọkpara ya, nwunye onye aha ya bụ Tama. 7Ma nʼihi na Ịa, ọkpara Juda, dị njọ nʼanya Onyenwe anyị. Onyenwe anyị gburu ya. 8Mgbe ahụ, Juda sịrị Onan, “Bakwuru nwunye nwanne gị ka ịkuchie ya, ka i si otu a wulite mkpụrụ maka nwanne gị.” 9Onan ma na mkpụrụ a agaghị abụ nke ya. Nʼihi ya, mgbe ọbụla ọ bakwuru nwunye nwanne ya, ọ na-anyụsa mkpụrụ nwa ya nʼala, ime ka ọ ghara inye nwanne ya nwoke nwa. 10Ma ihe a o mere jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị. Nʼihi ya Onyenwe anyị gbukwara ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.