Native Bible

Genesis 37:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ha lepụrụ anya hụ ya ka ọ na-abịa, gbaa izu otu ha ga-esi gbuo ya.

Genesis 37:18 in English

Genesis 37:18 · Berean Standard Bible

Now Joseph’s brothers saw him in the distance, and before he arrived, they plotted to kill him.

Context

16Ọ sịrị, “Ana m achọ ụmụnne m. Biko, ị nwere ike ịgwa m ebe ha nọ na-azụ igwe anụ ụlọ ha?” 17Nwoke ahụ zara sị, “Ha esitela nʼebe a pụọ. Anụrụ m ka ha na-asị, ‘Ka anyị gaa Dọtan.’ ” Ya mere, Josef gawara Dọtan ịchọ ụmụnne ya. Ọ hụkwara ha nʼebe dị nso na Dọtan. 18Ma ha lepụrụ anya hụ ya ka ọ na-abịa, gbaa izu otu ha ga-esi gbuo ya. 19Ha sịrịtara onwe ha, “Lee eze nrọ ahụ ka ọ na-abịa! 20Ugbu a, bịanụ, ka anyị gbuo ya, tụba ya nʼime otu olulu ndị a.* Anyị ga-asịkwa na anụ ọhịa eriela ya. Mgbe ahụ, anyị ga-ahụkwa ihe nrọ ya niile ga-abụ.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.