Native Bible

Genesis 37:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Jekọb bigidere nʼala Kenan, ala ahụ nna ya buru ụzọ biri nʼime ya.

Genesis 37:1 in English

Genesis 37:1 · Berean Standard Bible

Now Jacob lived in the land where his father had resided, the land of Canaan.

Context

1Jekọb bigidere nʼala Kenan, ala ahụ nna ya buru ụzọ biri nʼime ya. 2Nke a bụ usoro akụkọ banyere ezinaụlọ Jekọb. Josef, onye gbarala afọ iri na asaa, na-esonyere ụmụnne ya ndị ikom na-azụ igwe anụ ụlọ, ya onwe ya bụ naanị nwantakịrị na-enyere ụmụ Bilha na ụmụ Zilpa ndị nwunye nna ya aka. Ma Josef na-ewetara nna ha akụkọ maka ihe ọjọọ ha na-eme. 3Ma Izrel hụrụ Josef nʼanya karịa ụmụ ya ndị ikom ndị ọzọ niile nʼihi na Josef bụ nwa a mụụrụ ya nʼoge agadi ya. Ọ kwaara ya uwe mwụda nwere ọtụtụ agwa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.