Native Bible

Genesis 35:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe nke a gasịrị, Debọra, nwanyị lekọtara Ribeka mgbe ọ bụ nwantakịrị, nwụrụ. E liri ya nʼokpuru osisi ook dị na Betel. A kpọkwara ebe ahụ, “Osisi ook ebe ịkwa akwa.”

Genesis 35:8 in English

Genesis 35:8 · Berean Standard Bible

Now Deborah, Rebekah’s nurse, died and was buried under the oak * below Bethel. So Jacob named it Allon-bachuth.*

Context

6Jekọb na ndị niile so ya rutere Luz, nke a na-akpọkwa Betel nke dị na Kenan. 7Jekọb wuru ebe ịchụ aja nʼebe a, kpọọ aha ebe ahụ El Betel, nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ ka Chineke gosiri ya onwe ya mgbe ọ na-agbanarị Ịsọ nwanne ya nwoke. 8Mgbe nke a gasịrị, Debọra, nwanyị lekọtara Ribeka mgbe ọ bụ nwantakịrị, nwụrụ. E liri ya nʼokpuru osisi ook dị na Betel. A kpọkwara ebe ahụ, “Osisi ook ebe ịkwa akwa.” 9Chineke gosiri Jekọb onwe ya ọzọ, mgbe o sitere na Padan Aram pụta, gọziekwa ya. 10Chineke sịrị ya, “Aha gị bụ Jekọb ma a gaghị akpọkwa gị Jekọb ọzọ, kama aha gị ga-abụ Izrel.” Ya mere ọ kpọrọ ya Izrel.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.