Jenesis 35:6
Genesis 35:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Jekọb na ndị niile so ya rutere Luz, nke a na-akpọkwa Betel nke dị na Kenan.
Genesis 35:6 in English
Genesis 35:6 · Berean Standard Bible
So Jacob and everyone with him arrived in Luz (that is, Bethel) in the land of Canaan.
Context
4Ya mere, ha nyere Jekọb chi ndị ala ọzọ niile ha ji nʼaka, na ọla* niile dị ha na ntị. Jekọb chịịrị ha niile lie ha nʼokpuru osisi ook dị na Shekem. 5Ha biliri ije. Egwu Chineke dakwasịrị obodo niile gbara ha gburugburu. Ọ dịghị ndị chụsoro ha. 6Jekọb na ndị niile so ya rutere Luz, nke a na-akpọkwa Betel nke dị na Kenan. 7Jekọb wuru ebe ịchụ aja nʼebe a, kpọọ aha ebe ahụ El Betel, nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ ka Chineke gosiri ya onwe ya mgbe ọ na-agbanarị Ịsọ nwanne ya nwoke. 8Mgbe nke a gasịrị, Debọra, nwanyị lekọtara Ribeka mgbe ọ bụ nwantakịrị, nwụrụ. E liri ya nʼokpuru osisi ook dị na Betel. A kpọkwara ebe ahụ, “Osisi ook ebe ịkwa akwa.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.