Jenesis 34:6
Genesis 34:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Hamọ bụ nna Shekem, pụkwuuru Jekọb ka ha kparịta ụka.
Genesis 34:6 in English
Genesis 34:6 · Berean Standard Bible
Meanwhile, Shechem’s father Hamor came to speak with Jacob.
Context
4Shekem sịrị nna ya bụ Hamọ “Lụtara m nwaagbọghọ a, ka ọ bụrụ nwunye m.” 5Mgbe Jekọb nụrụ na e merụrụ Daịna nwa ya nwanyị, nʼihi na ụmụ ya ndị ikom nọ nʼọhịa ebe ha na-azụ anụ ụlọ, ọ gbara nkịtị na-emeghị ihe ọbụla ruo mgbe ha lọtara. 6Hamọ bụ nna Shekem, pụkwuuru Jekọb ka ha kparịta ụka. 7Ụmụ ndị ikom Jekọb si nʼọhịa na-alọta mgbe ha nụrụ ihe merenụ, iwe na ọnụma juputara ha obi nke ukwuu nʼihi na Shekem mere ihe na-eweta ihere nʼIzrel site nʼidinakwuru ada Jekọb, ihe a na-ekwesighị ime eme. 8Ma Hamọ sịrị ha, “Nwa m nwoke Shekem hụrụ nwa unu nwanyị nʼanya. Biko, kwerenụ ka ọ lụọ ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.