Native Bible

Genesis 34:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha gbukwara Hamọ na Shekem nwa ya nwoke, kpọpụta Daịna site nʼụlọ Shekem, laghachi nʼụlọ ha.

Genesis 34:26 in English

Genesis 34:26 · Berean Standard Bible

They killed Hamor and his son Shechem with their swords, took Dinah out of Shechem’s house, and went away.

Context

24Ndị ikom niile bịara nʼọnụ ụzọ ama obodo ahụ kwenyere nʼokwu Hamọ na nwa ya nwoke Shekem. E bikwara nwoke ọbụla nọ nʼobodo ahụ ugwu. 25O ruo nʼụbọchị nke atọ, mgbe ọnya ugwu ha na-egbu ha mgbu, ụmụ ndị ikom Jekọb abụọ, Simiọn na Livayị, ụmụnne Daịna, jiri mma agha ha pụkwuru ndị bi nʼobodo ahụ na-atụghị anya na ihe dị otu a ga-eme, gbuo ndị ikom niile nọ nʼobodo ahụ. 26Ha gbukwara Hamọ na Shekem nwa ya nwoke, kpọpụta Daịna site nʼụlọ Shekem, laghachi nʼụlọ ha. 27Mgbe ahụ ụmụ ndị ikom Jekọb niile bịakwasịrị ndị a e gburu egbu, kwakọọ ihe niile dị nʼobodo ahụ niile, nʼihi mmerụ e merụrụ nwanne ha nwanyị. 28Ha kwakọọrọ ngwongwo niile dị nʼobodo ahụ, kpụrụkwa anụ ụlọ niile, igwe ewu na atụrụ, igwe ehi na igwe ịnyịnya ibu niile, na ihe niile dị nʼime obodo ahụ, na ihe niile dị nʼubi ndị ahụ obodo nwere.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.