Native Bible

Genesis 34:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ọ dị otu ihe ha chọrọ ka anyị mee tupu ha ekwere ibi nʼetiti anyị ka anyị na ha bụrụ otu ndị. Ọ bụ ibi ndị ikom anyị niile ugwu dịka e si bie ha ugwu.

Genesis 34:22 in English

Genesis 34:22 · Berean Standard Bible

But only on this condition will the men agree to dwell with us and be one people: if all our men are circumcised as they are.

Context

20Emesịa, Hamọ na Shekem nwa ya nwoke gara nʼọnụ* ụzọ ama nke obodo ha gwa ndị ikom obodo ha okwu, sị. 21“Ndị ikom ndị a nwere mmasị nʼebe anyị nọ. Kwerenụ ka ha biri nʼala anyị, ka ha na-agagharị kwa nʼime ya. Anyị nwere ala buru ibu nke ga-ezuru anyị na ha. Ha ga-alụ ụmụ nwanyị anyị, anyị ga-alụkwa ndị nke ha. 22Ma ọ dị otu ihe ha chọrọ ka anyị mee tupu ha ekwere ibi nʼetiti anyị ka anyị na ha bụrụ otu ndị. Ọ bụ ibi ndị ikom anyị niile ugwu dịka e si bie ha ugwu. 23Ọ bụrụ na unu chọrọ ka anụ ụlọ ha niile na akụ ha niile bụrụ nke anyị, ọ dị mma ka anyị kwenyere ha, ka ha binyere anyị.” 24Ndị ikom niile bịara nʼọnụ ụzọ ama obodo ahụ kwenyere nʼokwu Hamọ na nwa ya nwoke Shekem. E bikwara nwoke ọbụla nọ nʼobodo ahụ ugwu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.