Native Bible

Genesis 34:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Emesịa, Hamọ na Shekem nwa ya nwoke gara nʼọnụ* ụzọ ama nke obodo ha gwa ndị ikom obodo ha okwu, sị.

Genesis 34:20 in English

Genesis 34:20 · Berean Standard Bible

So Hamor and his son Shechem went to the gate of their city and addressed the men of their city:

Context

18Obi tọrọ Hamọ na Shekem nwa ya nwoke ụtọ nʼihi ihe ụmụ ndị ikom Jekọb kwuru. 19Nwokorobịa ahụ bụ onye a na-asọpụrụ karịa onye ọbụla nʼụlọ nna ya egbughị oge ime ihe ha kwuru, nʼihi na ihe banyere nwa nwanyị Jekọb dị ya mma nke ukwuu. 20Emesịa, Hamọ na Shekem nwa ya nwoke gara nʼọnụ* ụzọ ama nke obodo ha gwa ndị ikom obodo ha okwu, sị. 21“Ndị ikom ndị a nwere mmasị nʼebe anyị nọ. Kwerenụ ka ha biri nʼala anyị, ka ha na-agagharị kwa nʼime ya. Anyị nwere ala buru ibu nke ga-ezuru anyị na ha. Ha ga-alụ ụmụ nwanyị anyị, anyị ga-alụkwa ndị nke ha. 22Ma ọ dị otu ihe ha chọrọ ka anyị mee tupu ha ekwere ibi nʼetiti anyị ka anyị na ha bụrụ otu ndị. Ọ bụ ibi ndị ikom anyị niile ugwu dịka e si bie ha ugwu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.