Jenesis 33:16
Genesis 33:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ịsọ laghachikwara azụ na Sia nʼotu ụbọchị ahụ.
Genesis 33:16 in English
Genesis 33:16 · Berean Standard Bible
So that day Esau started on his way back to Seir,
Context
14Ya mere, ka onyenwe m buru ohu ya ụzọ na-aga, ma ka m jiri nwayọọ nwayọọ na-abịa, dịka ike igwe anụ ndị a na ụmụaka ndị a si dị. Tutu ruo mgbe m ga-ezute onyenwe m na Sia.” 15Ịsọ sịrị, “Ọ bụrụ otu a, ka m hapụrụ gị ụfọdụ ndị a mụ na ha so.”
Ma Jekọb sịrị, “Nʼihi gịnị kwanụ? Ka m hụta naanị ihuọma nʼanya onyenwe m.” 16Ịsọ laghachikwara azụ na Sia nʼotu ụbọchị ahụ. 17Ma Jekọb na ezinaụlọ ya jere Sukọt, ebe o wuuru onwe ya ụlọ obibi, wuokwara anụ ụlọ ya ụlọ obibi ha. Ọ bụ nke a mere e ji kpọọ ebe ahụ Sukọt. 18Mgbe Jekọb si Padan Aram lọghachi, o rutere obodo Shekem nke dị nʼala Kenan nʼudo. O mara ụlọ ikwu ya nʼihu obodo ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.