Native Bible

Genesis 31:30 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ugbu a, ị na-ala nʼihi na ọ gụrụ gị agụụ ịlaghachi nʼụlọ nna gị, ma gịnị mere i ji zuru chi m?”

Genesis 31:30 in English

Genesis 31:30 · Berean Standard Bible

Now you have gone off because you long for your father’s house. But why have you stolen my gods?”

Context

28Gịnị mere i nyeghị m ohere ka m sutu ụmụ ụmụ m na ụmụ m ndị inyom ọnụ sị ha laa nke ọma? Omume a i mere bụ omume nzuzu. 29Enwere m ike merụọ gị ahụ ugbu a, ma Chineke nke nna gị mere ka m hụ ya anya na nrọ nʼabalị gara aga. Ọ dọrọ m aka na ntị sị m, ‘Kpachapụ anya gị hụ na o nweghị ihe ị gwara Jekọb, maọbụ okwu dị mma, maọbụ nke dị njọ.’ 30Ugbu a, ị na-ala nʼihi na ọ gụrụ gị agụụ ịlaghachi nʼụlọ nna gị, ma gịnị mere i ji zuru chi m?” 31Jekọb zara sị Leban, “Nʼihi na m tụrụ egwu, nʼihi na m chere sị na ị ga-eji ike napụ m ụmụ gị ndị inyom a. 32Ma ọ bụrụ na ị chọta onye ọbụla ji chi gị ndị a, onye ahụ ga-anwụ. Nʼihu ndị ikwu gị ndị a, chọgharịa nʼonwe gị, lee ma ị ga-achọta ihe ọbụla bụ nke gị dị m nʼaka. Ọ bụrụ na ị chọta ya, were ya.” Ma Jekọb amaghị na Rechel zuuru chi ndị ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.