Jenesis 31:14
Genesis 31:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Rechel na Lịa zara sị ya, “Anyị ka nwere oke nʼihe nketa nʼụlọ nna anyị?
Genesis 31:14 in English
Genesis 31:14 · Berean Standard Bible
And Rachel and Leah replied, “Do we have any portion or inheritance left in our father’s house?
Context
12Ọ sịrị m, ‘Lelie anya gị elu, lee ka ị hụ na mkpi niile na-agba igwe nne ewu ndị a bụ mkpi ndị ahụ tụrụ agwa agwa, ndị nwere akara maọbụ ndị nwere ntụpọ ọcha. Nʼihi na ahụla m ihe niile Leban na-eme gị. 13Mụ onwe m bụ Chineke nke Betel, ebe ị wụkwasịrị mmanụ nʼogidi nkume ahụ, ebe ị kwekwara m nkwa. Ugbu a, kulie, hapụ obodo a, laghachi nʼala a nọ mụọ gị.’ ” 14Rechel na Lịa zara sị ya, “Anyị ka nwere oke nʼihe nketa nʼụlọ nna anyị? 15Ọ bụghị dịka ndị ọbịa ka ọ gụnyeziri anyị? Nʼihi na o reela anyị, ripịakwa ụgwọ isi anyị. 16Nʼezie, akụ ndị ahụ Chineke napụrụ nna anyị bụ nke anyị na nke ụmụ anyị. Ya mere, mee ihe ọbụla Chineke sị gị mee.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.