Native Bible

Genesis 3:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Agwọ gwara nwanyị ahụ sị, “Unu agaghị anwụ.

Genesis 3:4 in English

Genesis 3:4 · Berean Standard Bible

“You will not surely die,” the serpent told her.

Context

2Nwanyị ahụ zara sị ya, “Anyị nwere ike rie mkpụrụ si nʼosisi niile dị nʼogige a 3ma Chineke kwuru sị, ‘Unu erila mkpụrụ si nʼosisi dị nʼetiti ogige a, unu emetụkwala ya aka, ka unu ghara ịnwụ.’ ” 4Agwọ gwara nwanyị ahụ sị, “Unu agaghị anwụ. 5Nʼihi na Chineke maara na ọ bụrụ na unu erie ya, anya unu ga-emeghe, unu ga-amata ezi ihe na ajọ ihe.” 6Nwanyị ahụ hụrụ na mkpụrụ si nʼosisi ahụ dị mma iri eri, na ọ dị mma nʼanya, na ọ bụ osisi mara mma e si enweta amamihe. Ọ ghọọrọ mkpụrụ ahụ rie, nyekwa di ya, onye nke na ya nọ, o rie.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.