Jenesis 29:35
Genesis 29:35 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ tụụrụ ime ọzọ mụọ nwa nwoke. O kwuru sị, “Ugbu a aga m eto Onyenwe anyị.” Ya mere, ọ kpọrọ aha ya Juda. Lịa mụsịrị nwa a kwụsị ịmụ ụmụ. 29:18 Onye ọbụla chọrọ ịlụ nwanyị na-akwụ nna nwaagbọghọ ahụ ego akụ, nʼisi ya. Jen 34:12 Ma ọ bụrụ na o nweghị ego ịkwụ ego akụ, ọ ga-arụrụ nna nwanyị ahụ ọrụ rụzuo ego ole, maọbụ afọ ole rụrụ ihe o kwesiri ịkwụ dịka ego akụ, nʼisi onye ahụ. 29:23 Ụmụ nwanyị a lụrụ alụ na-eji akwa mkpudo kpuchie ihu ha. Jen 24:65
Genesis 29:35 in English
Genesis 29:35 · Berean Standard Bible
And once more she conceived and gave birth to a son and said, “This time I will praise the LORD.” So she named him Judah.* Then Leah stopped having children.
Context
33Ọ tụụrụ ime ọzọ mụọkwa nwa nwoke. O kwuru sị, “Onyenwe anyị anụla na m bụ nwanyị a kpọrọ asị, ọ bụ ya mere o ji nye m nwa nwoke ọzọ.” Ya mere ọ kpọrọ aha ya Simiọn. 34Lịa tụrụ ime ọzọ, mgbe ọ mụrụ nwa nwoke, o kwuru sị, “Nʼezie, ugbu a ka di m ga-arapara m nʼahụ, nʼihi na amụọrala m ya ụmụ ndị ikom atọ.” Ya mere ọ kpọrọ aha ya Livayị. 35Ọ tụụrụ ime ọzọ mụọ nwa nwoke. O kwuru sị, “Ugbu a aga m eto Onyenwe anyị.” Ya mere, ọ kpọrọ aha ya Juda. Lịa mụsịrị nwa a kwụsị ịmụ ụmụ.
29:18 Onye ọbụla chọrọ ịlụ nwanyị na-akwụ nna nwaagbọghọ ahụ ego akụ, nʼisi ya. Jen 34:12 Ma ọ bụrụ na o nweghị ego ịkwụ ego akụ, ọ ga-arụrụ nna nwanyị ahụ ọrụ rụzuo ego ole, maọbụ afọ ole rụrụ ihe o kwesiri ịkwụ dịka ego akụ, nʼisi onye ahụ.
29:23 Ụmụ nwanyị a lụrụ alụ na-eji akwa mkpudo kpuchie ihu ha. Jen 24:65
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.