Jenesis 29:22
Genesis 29:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Leban kpọkọtara ndị niile bi nʼebe ahụ mere ha nʼoke oriri.
Genesis 29:22 in English
Genesis 29:22 · Berean Standard Bible
So Laban invited all the men of that place and prepared a feast.
Context
20Ya mere Jekọb gbara odibo afọ asaa maka Rechel. Ma afọ asaa ndị a dịka abalị ole na ole nʼanya Jekọb nʼihi ịhụnanya o nwere nʼebe Rechel nọ. 21Jekọb gwara Leban, okwu sị ya, “Kpọnye m nwunye m nʼihi nʼụbọchị m ezuola. Achọrọ m ịbakwuru ya.” 22Leban kpọkọtara ndị niile bi nʼebe ahụ mere ha nʼoke oriri. 23*Nʼanyasị ụbọchị ahụ, Leban kpọọrọ nwa ya nwanyị bụ Lịa kpọbara Jekọb, ọ bakwuuru ya. 24Leban nyekwara Lịa odibo ya, Zilpa, ka ọ bụrụ odibo nwanyị ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.