Jenesis 29:20
Genesis 29:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere Jekọb gbara odibo afọ asaa maka Rechel. Ma afọ asaa ndị a dịka abalị ole na ole nʼanya Jekọb nʼihi ịhụnanya o nwere nʼebe Rechel nọ.
Genesis 29:20 in English
Genesis 29:20 · Berean Standard Bible
So Jacob served seven years for Rachel, yet it seemed but a few days because of his love for her.
Context
18Ọ bụ Rechel ka Jekọb hụrụ nʼanya. Nʼihi ya Jekọb gwara Leban sị, “Aga m arụrụ gị ọrụ* afọ asaa ma ọ bụrụ na ị ga-ekwe ka m lụọ Rechel.” 19Leban zara Jekọb sị ya, “Ọ dị mma na ị lụrụ Rechel karịa na onye ọzọ ga-alụ ya. Soro m nọdụ nʼebe a.” 20Ya mere Jekọb gbara odibo afọ asaa maka Rechel. Ma afọ asaa ndị a dịka abalị ole na ole nʼanya Jekọb nʼihi ịhụnanya o nwere nʼebe Rechel nọ. 21Jekọb gwara Leban, okwu sị ya, “Kpọnye m nwunye m nʼihi nʼụbọchị m ezuola. Achọrọ m ịbakwuru ya.” 22Leban kpọkọtara ndị niile bi nʼebe ahụ mere ha nʼoke oriri.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.