Jenesis 28:10
Genesis 28:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Jekọb hapụrụ Bịasheba gawa Haran.
Genesis 28:10 in English
Genesis 28:10 · Berean Standard Bible
Meanwhile Jacob left Beersheba and set out for Haran.
Context
8O dokwara Ịsọ anya na ndị inyom Kenan dị njọ nʼanya nna ya Aịzik. 9Nʼihi ya, Ịsọ gakwuru Ishmel lụrụ Mahalat, ada Ishmel, nwa Ebraham, onye bụ nwanyị Nebaiot, tinyekwara ndị nwunye ọ lụrụ na mbụ. 10Jekọb hapụrụ Bịasheba gawa Haran. 11Mgbe chi na-eji, ọ kwụsịrị ebe ọ ga-anọ zuo ike abalị. Mgbe ọ chọrọ idina ala, o weere otu nʼime nkume ndị dị nʼebe ahụ hinye nʼisi ya, dinara ala ịrahụ ụra. 12Nʼabalị ahụ, ọ rọrọ nrọ, hụ mbube e ji arị elu. E mere ka o guzo site nʼụwa ruo nʼeluigwe. Ọ hụkwara ndị mmụọ ozi Chineke ka ha si na ya na-arịgo na-arịdakwa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.