Native Bible

Genesis 27:33 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Oke ahụ ọma jijiji mara Aịzik, ọ sị, “Onye kwanụ bụ onye ahụ gara gbute anụ butere m ya? Eriri m ya tupu ị bata. Agọziri m ya. Nʼezie, onye a gọziri agọzi ka ọ ga-abụ.”

Genesis 27:33 in English

Genesis 27:33 · Berean Standard Bible

Isaac began to tremble violently and said, “Who was it, then, who hunted the game and brought it to me? Before you came in, I ate it all and blessed him—and indeed, he will be blessed!”

Context

31Ya onwe ya sikwara nri na-atọ ụtọ butere nna ya. Mgbe ahụ, ọ gwara ya sị, “Ka nna m, bilie, rie anụ nwa ya si nʼọhịa gbute, ka gị onwe gị nye m ngọzị gị.” 32Aịzik zara sị ya, “Ị bụ onye?” Ọ zara sị, “Abụ m nwa gị nwoke Ịsọ, ọkpara gị Ịsọ.” 33Oke ahụ ọma jijiji mara Aịzik, ọ sị, “Onye kwanụ bụ onye ahụ gara gbute anụ butere m ya? Eriri m ya tupu ị bata. Agọziri m ya. Nʼezie, onye a gọziri agọzi ka ọ ga-abụ.” 34Mgbe Ịsọ nụrụ okwu ndị a si nʼọnụ nna ya, o jiri oke olu kwaa akwa nke obi ilu gwa nna ya sị ya, “Gọzie m, mụ onwe m, nna m.” 35Ma ọ zara sị ya, “Nwanne gị ejirila ụzọ aghụghọ bịa nara ngọzị gị.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.