Jenesis 27:31
Genesis 27:31 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya onwe ya sikwara nri na-atọ ụtọ butere nna ya. Mgbe ahụ, ọ gwara ya sị, “Ka nna m, bilie, rie anụ nwa ya si nʼọhịa gbute, ka gị onwe gị nye m ngọzị gị.”
Genesis 27:31 in English
Genesis 27:31 · Berean Standard Bible
He too made some tasty food, brought it to his father, and said to him, “My father, sit up and eat of your son’s game, so that you may bless me.”
Context
29Ka ọtụtụ mba jeere gị ozi,
ka ndị mmadụ kpọọ isiala nye gị.
Bụrụ onye ọchịchị nʼebe ụmụnna gị nọ,
ka ụmụ nne gị mụrụ kpọọ isiala nye gị.
Ka ndị niile na-abụ gị ọnụ bụrụ ndị a bụrụ ọnụ,
ka ndị na-agọzi gị bụrụ ndị a gọziri agọzi.” 30Mgbe Aịzik gọzichara Jekọb, ka Jekọb si nʼihu ya na-apụ, lee Ịsọ ka o si ịchụ nta na-alọbata. 31Ya onwe ya sikwara nri na-atọ ụtọ butere nna ya. Mgbe ahụ, ọ gwara ya sị, “Ka nna m, bilie, rie anụ nwa ya si nʼọhịa gbute, ka gị onwe gị nye m ngọzị gị.” 32Aịzik zara sị ya, “Ị bụ onye?”
Ọ zara sị, “Abụ m nwa gị nwoke Ịsọ, ọkpara gị Ịsọ.” 33Oke ahụ ọma jijiji mara Aịzik, ọ sị, “Onye kwanụ bụ onye ahụ gara gbute anụ butere m ya? Eriri m ya tupu ị bata. Agọziri m ya. Nʼezie, onye a gọziri agọzi ka ọ ga-abụ.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.