Jenesis 25:29
Genesis 25:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Otu ụbọchị, Jekọb nọ na-esi ofe mgbe Ịsọ si nʼọhịa bata. Agụụ na-agụkwa ya nke ukwuu.
Genesis 25:29 in English
Genesis 25:29 · Berean Standard Bible
One day, while Jacob was cooking some stew, Esau came in from the field and was famished.
Context
27Ha abụọ toro, Ịsọ ghọrọ onye ọka nʼịchụ nta, onye na-epiogharị nʼọhịa, ebe Jekọb bụ nwoke dị nwayọọ, onye na-anọ nʼetiti ụlọ ikwu. 28Aịzik hụrụ Ịsọ nʼanya nʼihi na ụtọ anụ Ịsọ na-egbute nʼọhịa na-adị ya mma, ma Ribeka hụrụ Jekọb nʼanya. 29Otu ụbọchị, Jekọb nọ na-esi ofe mgbe Ịsọ si nʼọhịa bata. Agụụ na-agụkwa ya nke ukwuu. 30Ịsọ rịọrọ Jekọb sị, “Nyetụ m ụfọdụ nʼime nri a na-acha uhie uhie ị na-esi ka m rie, nʼihi na agụụ na-agụ m hie nne.” (Ọ bụ ihe a mere e ji na-akpọ ya Edọm.*) 31Ma Jekọb zara ya, “Buru ụzọ resi m ọnọdụ ịbụ ọkpara gị.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.