Native Bible

Genesis 25:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Aịzik hụrụ Ịsọ nʼanya nʼihi na ụtọ anụ Ịsọ na-egbute nʼọhịa na-adị ya mma, ma Ribeka hụrụ Jekọb nʼanya.

Genesis 25:28 in English

Genesis 25:28 · Berean Standard Bible

Because Isaac had a taste for wild game, he loved Esau; but Rebekah loved Jacob.

Context

26Emesịa, nwanne ya pụtara, ma aka ya jidere ikiri ụkwụ Ịsọ. Nʼihi ya, a kpọrọ aha ya Jekọb. Aịzik gbara iri afọ isii mgbe Ribeka mụrụ ha. 27Ha abụọ toro, Ịsọ ghọrọ onye ọka nʼịchụ nta, onye na-epiogharị nʼọhịa, ebe Jekọb bụ nwoke dị nwayọọ, onye na-anọ nʼetiti ụlọ ikwu. 28Aịzik hụrụ Ịsọ nʼanya nʼihi na ụtọ anụ Ịsọ na-egbute nʼọhịa na-adị ya mma, ma Ribeka hụrụ Jekọb nʼanya. 29Otu ụbọchị, Jekọb nọ na-esi ofe mgbe Ịsọ si nʼọhịa bata. Agụụ na-agụkwa ya nke ukwuu. 30Ịsọ rịọrọ Jekọb sị, “Nyetụ m ụfọdụ nʼime nri a na-acha uhie uhie ị na-esi ka m rie, nʼihi na agụụ na-agụ m hie nne.” (Ọ bụ ihe a mere e ji na-akpọ ya Edọm.*)

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.