Native Bible

Genesis 24:48 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ehulatara m ala kpọọ isiala nye Onyenwe anyị. Etoro m Onyenwe anyị, Chineke nke nna m ukwu Ebraham, onye duru m nʼezi ụzọ inweta nwa nwanne nna m ukwu dịka nwunye nwa ya nwoke.

Genesis 24:48 in English

Genesis 24:48 · Berean Standard Bible

Then I bowed down and worshiped the LORD; and I blessed the LORD, the God of my master Abraham, who led me on the right road to take the granddaughter of my master’s brother for his son.

Context

46“Ngwangwa, o sitere nʼubu ya budata ite, sị m, ‘Ṅụọ, aga m ekutekwa mmiri nke ịnyịnya kamel ndị a ga-aṅụ.’ Ya mere, aṅụrụ m, o nyekwara ịnyịnya kamel m ndị ahụ mmiri ha ṅụrụ. 47“Mgbe ahụ, ajụrụ m ya, ‘Nwa onye ka ị bụ?’ “Ọ sịrị m, ‘Abụ m nwa Betuel onye bụ nwa Nahọ nke Milka mụtaara ya.’ “Mgbe ahụ etinyere m ya mgbanimi ahụ nʼimi ya, tinyekwa ọlaaka ahụ nʼaka ya abụọ. 48Ehulatara m ala kpọọ isiala nye Onyenwe anyị. Etoro m Onyenwe anyị, Chineke nke nna m ukwu Ebraham, onye duru m nʼezi ụzọ inweta nwa nwanne nna m ukwu dịka nwunye nwa ya nwoke. 49Ugbu a, ọ bụrụ na unu ga-egosi nna m ukwu obiọma na ikwesi ntụkwasị obi gwanụ m. Ọ bụrụkwanụ na ọ gaghị esi otu a dịrị, gwanụ m ka m mata ụzọ m ga-agbaso.” 50Leban na Betuel zara sị ya, “Ihe niile si nʼaka Onyenwe anyị. Anyị enweghị ike ịgwa gị okwu ọjọọ maọbụ nke ọma.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.