Jenesis 24:47
Genesis 24:47 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Mgbe ahụ, ajụrụ m ya, ‘Nwa onye ka ị bụ?’ “Ọ sịrị m, ‘Abụ m nwa Betuel onye bụ nwa Nahọ nke Milka mụtaara ya.’ “Mgbe ahụ etinyere m ya mgbanimi ahụ nʼimi ya, tinyekwa ọlaaka ahụ nʼaka ya abụọ.
Genesis 24:47 in English
Genesis 24:47 · Berean Standard Bible
Then I asked her, ‘Whose daughter are you?’ She replied, ‘The daughter of Bethuel son of Nahor, whom Milcah bore to him.’ So I put the ring on her nose and the bracelets on her wrists.
Context
45“Tupu m kpesịa ekpere a nʼobi m, lekwa Ribeka ka o bụ ite mmiri ya nʼubu ya na-abịa. Ọ gbadara nʼisi iyi mmiri ahụ kute mmiri. Asịrị m ya, ‘Biko nye m mmiri ka m ṅụọ.’ 46“Ngwangwa, o sitere nʼubu ya budata ite, sị m, ‘Ṅụọ, aga m ekutekwa mmiri nke ịnyịnya kamel ndị a ga-aṅụ.’ Ya mere, aṅụrụ m, o nyekwara ịnyịnya kamel m ndị ahụ mmiri ha ṅụrụ. 47“Mgbe ahụ, ajụrụ m ya, ‘Nwa onye ka ị bụ?’
“Ọ sịrị m, ‘Abụ m nwa Betuel onye bụ nwa Nahọ nke Milka mụtaara ya.’
“Mgbe ahụ etinyere m ya mgbanimi ahụ nʼimi ya, tinyekwa ọlaaka ahụ nʼaka ya abụọ. 48Ehulatara m ala kpọọ isiala nye Onyenwe anyị. Etoro m Onyenwe anyị, Chineke nke nna m ukwu Ebraham, onye duru m nʼezi ụzọ inweta nwa nwanne nna m ukwu dịka nwunye nwa ya nwoke. 49Ugbu a, ọ bụrụ na unu ga-egosi nna m ukwu obiọma na ikwesi ntụkwasị obi gwanụ m. Ọ bụrụkwanụ na ọ gaghị esi otu a dịrị, gwanụ m ka m mata ụzọ m ga-agbaso.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.