Native Bible

Genesis 24:33 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

E doziri ya ihe oriri, ma ọ zara sị, “Agaghị m eri ihe ọbụla tutu ruo mgbe m kwuru ihe m ji bịa.” Leban sịrị, “Ngwa, kwuonụ.”

Genesis 24:33 in English

Genesis 24:33 · Berean Standard Bible

Then a meal was set before the man, but he said, “I will not eat until I have told you what I came to say.” So Laban said, “Please speak.”

Context

31Ọ sịrị ya, “Bịa, gị onye Onyenwe anyị gọziri. Gịnị mere i ji guzo nʼebe a. Edozielara m gị ụlọ ebe ị ga-edina na ebe ịnyịnya kamel ndị a ga-anọ.” 32Ya mere, nwoke ahụ gara nʼụlọ, ebe Leban nyere aka butukwaara ya ibu nke ịnyịnya kamel ndị ahụ bu. E wetara nri nye ịnyịnya kamel ndị ahụ, wetara ya mmiri nke ya na ndị ikom so ya ji saa ụkwụ ha. 33E doziri ya ihe oriri, ma ọ zara sị, “Agaghị m eri ihe ọbụla tutu ruo mgbe m kwuru ihe m ji bịa.” Leban sịrị, “Ngwa, kwuonụ.” 34Ya mere, ọ sịrị, “Abụ m ohu Ebraham. 35Onyenwe anyị agọziela nna m ukwu, mee ya ka ọ bụrụ ọgaranya. O nyela ya igwe atụrụ, na igwe ehi, na ọlaọcha na ọlaedo, na ọtụtụ ndị ohu nwoke na nwanyị, na ịnyịnya kamel, na ịnyịnya ibu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.