Native Bible

Genesis 23:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Gee m ntị, nna m ukwu, ọ bụ ezie na ala ahụ ruru narị shekel ọlaọcha anọ, ma gịnị ka nke a bụ nʼetiti mụ na gị? Gaa lie onye gị nwụrụ anwụ nʼime ya.”

Genesis 23:15 in English

Genesis 23:15 · Berean Standard Bible

“Listen to me, my lord. The land is worth four hundred shekels of silver,* but what is that between you and me? Bury your dead.”

Context

13ọ sịrị Efrọn, nʼihu ha niile, “Biko gee m ntị, aga m akwụ gị ọnụahịa iji zụọ ala ahụ. Nara m ya ka m nwee ike lie onye m nwụrụ anwụ nʼime ya.” 14Efrọn zara Ebraham, 15“Gee m ntị, nna m ukwu, ọ bụ ezie na ala ahụ ruru narị shekel ọlaọcha anọ, ma gịnị ka nke a bụ nʼetiti mụ na gị? Gaa lie onye gị nwụrụ anwụ nʼime ya.” 16Ebraham kwenyere nʼego ole Efrọn chọrọ ka ọ kwụọ. O ji ihe ọtụtụ tụpụtara Efrọn ego ruru ọnụahịa ọ kpọrọ aha nʼihu ndị Het niile, narị shekel ọlaọcha anọ, dịka ihe ọtụtụ nke dị nʼoge ahụ nʼetiti ndị na-azụ ahịa. 17Site nʼoge ahụ, ala ahụ Efrọn nwere na Makipela, nke dị nso na Mamre, ala ahụ na ọgba dị nʼime ya, na osisi niile dị nʼime ala ahụ niile gburugburu,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.