Native Bible

Genesis 21:32 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ha gbachara ndụ nkwekọrịta na Bịasheba, Abimelek na Fikọl onyeisi agha ya laghachiri azụ nʼala ndị Filistia.

Genesis 21:32 in English

Genesis 21:32 · Berean Standard Bible

After they had made the covenant at Beersheba, Abimelech and Phicol the commander of his army got up and returned to the land of the Philistines.

Context

30Ebraham zara sị, “Nabata ụmụ atụrụ asaa ndị a dịka ihe akaebe na-egosi na ọ bụ m gwuru olulu mmiri a.” 31Ya mere, e bidoro ịkpọ ebe ahụ Bịasheba, nʼihi na nʼebe ahụ ka mmadụ abụọ a nọ ṅụrịtaara onwe ha iyi. 32Mgbe ha gbachara ndụ nkwekọrịta na Bịasheba, Abimelek na Fikọl onyeisi agha ya laghachiri azụ nʼala ndị Filistia. 33Ebraham kụrụ osisi tamarisk na Bịasheba. Ebe ahụ ka ọ nọ kpọkuo aha Onyenwe anyị, Chineke ebighị ebi. 34Ebraham bigidere nʼala ndị Filistia ogologo oge. 21:8 Nʼusoro omenaala, ọ bụ mgbe nwantakịrị gbara afọ abụọ, maọbụ atọ ka a na-akwụsị ya ara. Nʼoge ochie, ị kwụsị nwantakịrị ara na-abụ oge mmemme na oke oriri. 21:17 Chineke anụla Maọbụ, Chineke na-anụ, bụ ihe Ishmel pụtara.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.