Native Bible

Genesis 2:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onyenwe anyị Chineke kpụrụ mmadụ site nʼaja nke ala, kunye ya ume ndụ nʼimi ya, nke mere ka mmadụ ghọọ ihe dị ndụ.

Genesis 2:7 in English

Genesis 2:7 · Berean Standard Bible

Then the LORD God formed man from the dust of the ground and breathed the breath of life into his nostrils, and the man became a living being.*

Context

5Ahịhịa ọbụla epupụtabeghị nʼọhịa, o nwekwaghị ihe ubi ọbụla sitere nʼala pupụta, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke ezitebeghị mmiri ozuzo nʼelu ụwa, o nwekwaghị mmadụ ọbụla nọ na-arụ ọrụ ubi, 6ma mmiri si nʼala na-asọpụta na-asọ nʼelu ala niile. 7Onyenwe anyị Chineke kpụrụ mmadụ site nʼaja nke ala, kunye ya ume ndụ nʼimi ya, nke mere ka mmadụ ghọọ ihe dị ndụ. 8Onyenwe anyị Chineke kụrụ ubi a gbara ogige nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, nʼIden. O tinyere mmadụ ahụ ọ kpụrụ nʼime ubi a. 9Onyenwe anyị Chineke mere ka osisi dị iche iche si nʼala pupụta, osisi ndị dị mma ile anya na nke dịkwa mma iri eri. Nʼetiti ogige a, e nwere osisi na-enye ndụ, na osisi nke ịmata ihe ọma na ihe ọjọọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.