Jenesis 15:8
Genesis 15:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma Ebram zara sị, “Biko, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị olee otu m ga-esi mara na m ga-enweta ya?”
Genesis 15:8 in English
Genesis 15:8 · Berean Standard Bible
But Abram replied, “Lord GOD, how can I know that I will possess it?”
Context
6Ebram kweere nʼihe Onyenwe anyị kwuru. Nʼihi nke a, a gụnyere ya okwukwe a dịka ezi omume. 7Onyenwe anyị gwakwara ya sị, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, onye si nʼala Ụọ nke ndị Kaldịa kpọpụta gị, inye gị ala a ka ọ bụrụ ihe nweta gị.” 8Ma Ebram zara sị, “Biko, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị olee otu m ga-esi mara na m ga-enweta ya?” 9Onyenwe anyị zara sị ya, “Wetara m nwa nne ehi gbara afọ atọ, na nne ewu gbara afọ atọ, na ebule gbara afọ atọ, na nduru, na nwa kpalakwukwu.” 10Ebram wetaara ya ihe ndị a niile bọwaa ha ụzọ abụọ, doo ha nʼusoro ka otu akụkụ chee akụkụ nke ọzọ ihu. Ma ọ bọwaghị ụmụ nnụnụ ndị ahụ.*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.