Native Bible

Genesis 15:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ebram wetaara ya ihe ndị a niile bọwaa ha ụzọ abụọ, doo ha nʼusoro ka otu akụkụ chee akụkụ nke ọzọ ihu. Ma ọ bọwaghị ụmụ nnụnụ ndị ahụ.*

Genesis 15:10 in English

Genesis 15:10 · Berean Standard Bible

So Abram brought all these to Him, split each of them down the middle, and laid the halves opposite each other. The birds, however, he did not cut in half.

Context

8Ma Ebram zara sị, “Biko, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị olee otu m ga-esi mara na m ga-enweta ya?” 9Onyenwe anyị zara sị ya, “Wetara m nwa nne ehi gbara afọ atọ, na nne ewu gbara afọ atọ, na ebule gbara afọ atọ, na nduru, na nwa kpalakwukwu.” 10Ebram wetaara ya ihe ndị a niile bọwaa ha ụzọ abụọ, doo ha nʼusoro ka otu akụkụ chee akụkụ nke ọzọ ihu. Ma ọ bọwaghị ụmụ nnụnụ ndị ahụ.* 11Mgbe anụ ufe fekwasịrị ozu anụ ndị ahụ, Ebram chụpụrụ ha. 12Mgbe anwụ bidoro ịda, Ebram dara nʼoke ụra, oke ụjọ na oke ọchịchịrị dakwasịrị ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.