Jenesis 12:3
Genesis 12:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m agọzi ndị na-agọzi gị, ma onye ọbụla kọchara gị ka m ga-akọcha; a ga-agọzikwa agbụrụ niile nọ nʼụwa site na gị.”
Genesis 12:3 in English
Genesis 12:3 · Berean Standard Bible
I will bless those who bless you and curse those who curse you; and all the families of the earth will be blessed through you.*”
Context
1Onyenwe anyị gwara Ebram okwu sị, “Site nʼobodo gị, sikwa na ụmụnna gị na ezinaụlọ nna gị, gaa nʼala m ga-egosi gị. 2“Aga m eme gị mba ukwu,
aga m agọzi gị,
aga m eme ka aha gị dị ukwuu,
ị ga-abụ ngọzị. 3Aga m agọzi ndị na-agọzi gị,
ma onye ọbụla kọchara gị ka m ga-akọcha;
a ga-agọzikwa agbụrụ niile nọ nʼụwa
site na gị.” 4Ya mere, Ebram hapụrụ gaa dịka Onyenwe anyị gwara ya. Lọt sokwa ya. Ebram agbaala iri afọ asaa na ise mgbe o si na Haran bulie ije. 5O duru nwunye ya Serai na Lọt nwa nwanne ya, chịkọtakwa akụ niile ha kpakọbara, na ndị ohu niile ha nwetara nʼala Haran, chee ihu ịga nʼala Kenan. Emesịa ha rutere nʼebe ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.